Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 108 - Bible Nso


Abù, Abù Ọma Devid.

1 Edoziwo obim, Chineke; M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù.

2 Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.

3 M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova: M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.

4 N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

5 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke: Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile.

6 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

7 Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

8 Mu nwe Gilead; mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.

9 Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.

10 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom?

11 Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.

12 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

13 Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan