Abụ Ọma 105 - Bible Nso1 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa. 2 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile. 3 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya: Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria. 4 Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile. 5 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya; 6 Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya, Umu Jekob, ndi-Ya arọputara. 7 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi: N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di. 8 O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu; 9 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara, Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak; 10 O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru, Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi: 11 Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa: 12 Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya; 13 Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ. 14 Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha; 15 Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam. 16 O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri. 17 O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù: 18 Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè: 19 Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya. 20 Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ. 21 O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara: 22 Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe. 23 Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham. 24 O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha. 25 Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ. 26 O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara. 27 Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham. 28 O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile. 29 Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua. 30 Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha. 31 O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile. 32 O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha. 33 O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha. 34 O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu, 35 Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha. 36 O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile. 37 O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile. 38 Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara; N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha. 39 Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali. 40 Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha. 41 O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri. 42 N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya. 43 O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta. 44 O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile; Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara: 45 Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria