Abụ Ọma 104 - Bible Nso1 Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Jehova, Chinekem I di uku nke-uku; Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe. 2 Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba: 3 Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri: Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya; Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe: 4 Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe; Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu: 5 Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike, Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. 6 I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe; N'elu ugwu nile ka miri nēguzo. 7 Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga; Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ; 8 (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;) Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha. 9 I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa. 10 Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu; N'etiti ugwu ka ha nērù: 11 Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu; Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha. 12 N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi, Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà. 13 I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile. 14 I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo Nēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu; Ime ka nri si n'ala puta: 15 Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria, Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu, Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi. 16 Afọ nēju osisi nile nke Jehova; Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo; 17 Ebe umu-nnunu na-akù akwú: Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya. 18 Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia; Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà. 19 O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà: Anyanwu mara ọdida-ya. 20 I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali; Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa. 21 Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u, N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke. 22 Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha, We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche. 23 Madu nāpu ga ọlu-ya Ga kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi. 24 Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova! N'amam-ihe ka I meworo ha nile: Uwa juputara n'ihe I nwetara. 25 Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua, Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu, Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku. 26 N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya. 27 Ha nile nēle anya Gi, Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. 28 I nēnye ha, ha achikọta ya; I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha. 29 I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha. 30 I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu. 31 Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi; Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile: 32 Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji; Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku. 33 M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu. 34 Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova. 35 Ka eme ka ndi-nmehie si n'uwa gwusia, Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ. Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Tonu Ja. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria