Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 10 - Bible Nso

1 Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya? N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?

2 Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.

3 N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike, Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.

4 Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

5 Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile; Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru: Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

6 o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.

7 Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu: N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.

8 Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile: N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ: Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.

9 Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya: Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala: Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.

10 Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu, Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.

11 Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.

12 Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu: Echezọla ndi ewedara n'ala.

13 N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke? Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.

14 I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.

15 Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.

16 Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi: Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì.

17 I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova: I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:

18 Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe, Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan