Abụ nke Abụ 8 - Bible Nso1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke, Nke miworo ara abua nke nnem! Mb͕e m'huru gi n'èzí, m'gēsutu gi ọnu; Ma ọ dighi onye gēledam anya. 2 M'gēduru gi, me ka i ba n'ulo nnem, I gēzím ihe; M'gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ, Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu. 3 Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim, Aka-nri-ya gāb͕akum. 4 Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi, Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta? Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ. 5 Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota, Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ? N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi: N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi, N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi. 6 Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya. 7 Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya, Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya: Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya, Agēleda ya anya nke-uku. 8 Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà, Ma ọ dighi ara ọ kpuru: Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi N'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya? 9 Ọ buru na ọ bu mb͕idi, Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha: Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ, Ayi gēji ibo cedar mechibido ya. 10 Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya: Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo. 11 Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon; Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche; Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri. 12 Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum: Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon, Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya. 13 Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige, Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi: Mem ka m'nuru ya. 14 B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ, Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke uda di iche iche. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria