Abụ nke Abụ 7 - Bible Nso1 Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya! Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma, Ọlu aka onye-ǹkà. 2 Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu, Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya: Afọ-gi di ka obo ọka wheat Nke eji urodi b͕a ya buruburu. 3 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua Nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru. 4 Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú; Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim; Imi-gi di ka ulo-elu Lebanon Nke chere Damaskọs iru. 5 Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel, Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo; Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile. 6 Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku, Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile! 7 Ogologo-gi nka yiri nkwu, Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine. 8 M'siri, M'gārigo elu nkwu, M'gējide igu-ya aka: Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine, Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple; 9 Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura. 10 Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa. 11 Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia; Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà. 12 Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam. 13 Mandrake nile nēsì ísì utọ, Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie, Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria