Abụ Akwa 3 - Bible Nso1 Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. 2 Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. 3 N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. 4 O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. 5 O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. 6 N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. 7 Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. 8 Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. 9 O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ. 10 Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche. 11 Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu. 12 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú. 13 O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. 14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. 15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. 16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. 17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. 18 M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. 19 Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. 20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. 21 Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. 22 O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. 23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. 24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. 25 Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. 26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. 27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata. 28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya. 29 Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi. 30 Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ. 31 N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. 32 N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. 33 N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru. 34 Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu, 35 Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu, 36 Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma. 37 Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu? 38 Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa? 39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile? 40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova. 41 Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua. 42 Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi. 43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko. 44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga. 45 Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche. 46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi. 47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia. 48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim. 49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi, 50 Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu. 51 Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom. 52 Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu. 53 Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume. 54 Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom. 55 Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova. 56 Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum. 57 I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu. 58 Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum. 59 Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem. 60 I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum. 61 I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem; 62 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile. 63 Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara. 64 I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di. 65 I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha. 66 I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria