2 Samuel 22 - Bible Nso1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl: 2 ọ we si, Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere; 3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike. 4 Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova, Ewe zọputam n'aka ndi-irom. 5 N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu. 6 Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu; Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum. 7 Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku: O we si n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua. 8 Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku. 9 Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya. 10 O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua. 11 O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we fere: Ewe hu Ya n'elu nkù ìfùfè. 12 O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu, Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé. 13 Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya Afunwuru icheku ọku. 14 Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da. 15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Àmùmà kwa, O we chusa ha. 16 Ewe hu ebe osimiri si erù, Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, N'ibasi-nba-ike nke Jehova, Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya. 17 O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri; 18 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim 19 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. 20 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara: Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. 21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ. 22 N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem. 23 N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum: Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di. 24 M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem. 25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di. 26 N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere, N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; 27 N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á. 28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala: Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala. 29 N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova: Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. 30 N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi. 31 Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. 32 N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? 33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm. 34 O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam. 35 O nēzí akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. 36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. 37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa. 38 Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha; Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia. 39 M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa: Ha we da n'okpuru ukwum abua. 40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum. 41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha. 42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha; N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha. 43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha. 44 I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè. 45 Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum: Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti. 46 Ndi ala ọzọ nāta aru, Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta. 47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu: 48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum, 49 Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike. 50 N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. 51 Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria