1 Ihe E Mere 9 - Bible Nso1 Ewe de Israel nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n'akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n'ihi nmekpu ha mekpuru. 2 Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim. 3 Ma ufọdu nime umu Juda, na ufọdu nime umu Benjamin, na ufọdu nime umu Efraim na Manase, biri na Jerusalem; 4 Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n'umu Perez nwa Juda. 5 Ndi sitere na ndi Shailo; Asaia, bú ọkpara, na umu-ya ndikom. 6 Ndi sitere n'umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri. 7 Ndi sitere n'umu Benjamin; Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaia, nwa Hasenua; 8 na Ibneia nwa Jeroham, na Ila nwa Uzi, nwa Mikri, na Meshulam nwa Shefataia, nwa Reuel, nwa Ibnija; 9 na umu-nne-ha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nnù madu abua na ọgu asa na iri na isi. Ndikom ndia nile bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna diri ulo nke ndi bu nna-ha. 10 Ndi sitere na ndi-nchu-aja; Jedaia, na Jehoiarib, na Jakin; 11 na Azaraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke; 12 na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea; 13 na umu-nne-ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha nwere, nnù madu anọ na ọgu asatọ; ndi-dike ndi bu dìnkpà ije ozi òfùfè ulo Chineke. 14 Ndi sitere na ndi Livai; Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, site n'umu Merari; 15 na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf; 16 na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n'obodo ntà ndi Netofa. 17 Ndi-ọnu-uzọ-ama kwa; Shalum, na Akub, na Talmon, na Ahaiman, na umu-nne-ha: Shalum bu onye-isi; 18 ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere. 19 Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata; 20 Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya. 21 Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 22 Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n'obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n'ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi. 23 Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n'ihe-ndebe. 24 N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida. 25 Ma umu-nne-ha, n'obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha: 26 n'ihi na n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke. 27 Buruburu ulo Chineke ka ha nānọ kwa ọnọdu-abali, n'ihi na n'isi-ha ka ndebe di, ha onwe-ha nwe-kwa-ra imeghe ya kwa-ututu. 28 Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha. 29 Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche. 30 Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche. 31 Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n'ite isi ihe. 32 Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike. 33 Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu. 34 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem. 35 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka: 36 na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab; 37 na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot. 38 Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha. 39 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal. 40 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika. 41 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz. 42 Ehaz we mua Jara; Jara mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza; 43 Moza mua Binea; Refaia bu kwa nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya: 44 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan: ndia bu umu-ndikom Azel. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria