1 Ihe E Mere 24 - Bible Nso1 Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 2 Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà. 3 Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha. 4 Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 5 Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama. 6 Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama. 7 Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia; 8 nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim; 9 nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin; 10 nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija; 11 nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania; 12 nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim; 13 nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab; 14 nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea; 15 nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez; 16 nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel; 17 nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul; 18 nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia. 19 Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu. 20 Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia. 21 Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia. 22 Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat. 23 Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ. 24 Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia. 25 Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia. 26 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno. 27 Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri. 28 Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom. 29 Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel. 30 Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 31 Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria