1 Ihe E Mere 2 - Bible Nso1 Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun; 2 Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha. 3 Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua. 4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise. 5 Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul. 6 Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise. 7 Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ewezugara nye Jehova. 8 Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia. 9 Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai. 10 Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda: 11 Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz; 12 Boaz mua Obed, Obed mua Jesi; 13 Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ; 14 na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise; 15 na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa: 16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ. 17 Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael. 18 Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon. 19 Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua. 20 Hua mua Uri, Uri mua Bezalel. 21 Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub. 22 Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead. 23 Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead. 24 Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa. 25 Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija. 26 Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam. 27 Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka. 28 Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua. 29 Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid. 30 Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom. 31 Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai. 32 Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom. 33 Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel. 34 Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha. 35 Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai. 36 Atai mua Netan, Netan mua Zabad; 37 Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed; 38 Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia; 39 Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa; 40 Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum; 41 Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama. 42 Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron. 43 Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema. 44 Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai. 45 Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua. 46 Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez. 47 Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf. 48 Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana. 49 Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa. 50 Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim; 51 Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea. 52 Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot. 53 Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta. 54 Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra. 55 Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria