Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Nehum 1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.


Iwe Onyenwe anyị megide Ninive

2 Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.

3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.

4 Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.

5 Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.

6 Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.

7 Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

8 ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.

9 Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.

10 Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.

11 Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.

12 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.

13 Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”

14 Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”

15 Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan