Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Nehemaya 1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Ekpere Nehemaya

1 Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya: Nʼọnwa Kislev, nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,

2 otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani, na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.

3 Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”

4 Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ,

5 si ya: “Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m.

6 Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.

7 Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.

8 “Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.

9 Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’

10 “Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.

11 Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan