Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Matiu 17 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Nnwogha Jisọs nwoghara

1 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ.

2 Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.

3 Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.

4 Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.”

5 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.”

6 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu.

7 Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”

8 Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs.

9 Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.”

10 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”

11 Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ.

12 Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.”

13 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya.


Ọ gwọrọ nwa akwụkwụ

14 Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya,

15 rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri.

16 Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.”

17 Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.”

18 Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.

19 Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”

20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.

21 Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.”


Jisọs ekwuo okwu ọnwụ ya ọzọ

22 Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ.

23 Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.


Ịtụ ụtụ ụlọnsọ ukwu

24 Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”

25 Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”

26 Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ.

27 Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan