Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Jeremaya 47 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Ozi e ziri banyere ndị Filistia

1 Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.

2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.

3 Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.

4 Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile, mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ, ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka. Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia, o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.

5 Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?

6 “ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’

7 Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike, ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu ibu agha megide Ashkelọn, na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan