Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Jeremaya 12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Mkpesa Jeremaya

1 Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị, mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị. Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị: Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma? Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?

2 Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

3 Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.

4 Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”


Ọsịsa Chineke nyere

5 “Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?

6 Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.

7 “Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya.

8 Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.

9 Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

10 Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

11 Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.

12 Ndị mbibi ga-ejupụta nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara, nʼihi na mma agha Onyenwe anyị ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya. O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.

13 Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha. Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla. Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu, nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”

14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda.

15 Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.

16 Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m.

17 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan