Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Ilu 7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Ịdọ aka na ntị banyere nwanyị na-akwa iko

1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.

2 Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.

3 Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.

5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.

6 Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,

7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ,

8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,

9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.

10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.

11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.

12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)

13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:

14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,

15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.

16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.

17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.

18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.

19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.

20 O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”

21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.

22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,

23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.

24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.

25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.

26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.

27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan