Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Ilu 16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.

2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

3 Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.

5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.

6 Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

7 Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.

8 Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.

9 Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

10 Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.

11 Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.

12 Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.

13 Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.

14 Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.

15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.

16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.

17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.

18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.

19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.

20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.

22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.

23 Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.

24 Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.

25 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

26 Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.

27 Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.

28 Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.

29 Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.

30 Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.

31 Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.

32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

33 A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan