Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Hosiya 3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Hosiya na nwunye ya adịrịkwa na mma

1 Onyenwe anyị gwara m ọzọ, “Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee.”

2 Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya.

3 Mgbe ahụ agwara m ya, “Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, ị gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe ị nọ.”

4 Nke a na-egosi na Izrel ga-anọ ogologo mgbe na-enweghị eze maọbụ onye ọchịchị. Ọ gaghị enwe ịchụ aja maọbụ nkume nsọ maọbụ efọọd maọbụ arụsị ezinaụlọ.

5 Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan