Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Emọs 5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Abụ akwa na ịkpọ oku maka nchegharị

1 Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:

2 “Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala, ọ gaghị ebilite ọzọ, onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya, ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.”

3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel, “Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike, ka naanị narị ga-afọdụ, obodo unu na-ezipụ narị ndị ike ka naanị iri ga-afọdụrụ.”


Chọsienụ Chineke ike ka unu dị ndụ

4 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel, “Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.

5 Unu achọla Betel, unu abanyekwala na Gilgal, maọbụ ga ije ruo Bịasheba. Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ, ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”

6 Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ, ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ, ọ ga-erepịa ha. Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.

7 Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.

8 Onye mere kpakpando pleiades na orion, onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, wụsa ha nʼelu ala akọrọ, Onyenwe anyị bụ aha ya.

9 Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.

10 Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.

11 Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.

12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.

13 Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.

14 Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; ka unu dịrị ndụ. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, dịka unu si kwuo.

15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya. Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu. O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.

16 Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.

17 A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” ka Onyenwe anyị kwuru.


Ụbọchị Onyenwe anyị

18 Ahụhụ dịrị unu, ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.

19 Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.

20 Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?

21 “Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya. Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.

22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.

23 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.

24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

25 “Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara, unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?

26 Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, nke unu kpụrụ nye onwe unu.

27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,” ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan