Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Aịzaya 31 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-atụkwasị Ijipt obi

1 Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.

2 Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.

3 Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

4 Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu, nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, ọ naghị atụ egwu mkpu ha, mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu, Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.

5 Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya, otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem, ọ ga-ekpuchi ya napụta ya, ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”

6 Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide.

7 Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.

8 “Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ, mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha. Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ, ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.

9 Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan