Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Aịzaya 27 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Mgbapụta dịrị Izrel

1 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.

2 Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.

3 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.

4 Adịghị m ewekwa iwe. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba, aga m ebili buso ha agha, aga m esurekwa ha ọkụ.

5 Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”

6 Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.

7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha.

8 Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha.

9 Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.

10 Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.

11 Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.

12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.

13 Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan