Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Aịzaya 24 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Mbibi Onyenwe anyị ga-ebibi ụwa

1 Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ. Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa, mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.

2 Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile, nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ, nye ụmụodibo na ndị nwe ha, nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu, nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire; nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego; nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.

3 O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.

4 Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.

5 Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.

6 Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.

7 Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.

8 Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.

9 Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa; mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.

10 Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.

11 Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa. Ọṅụ adịghịkwa, otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.

12 Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe, e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.

13 Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile, nakwa nʼetiti mba niile, dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv, maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.

14 Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.

15 Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.

16 Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”

17 Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.

18 Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.

19 Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.

20 Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu. Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị. Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ, nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.

21 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ. Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.

22 A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.

23 Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan