Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

1 Ihe E Mere 1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a


Usoro ọmụmụ site nʼAdam ruo Ebraham Ruokwa ụmụ Noa

1 Adam, Set, Enọsh,

2 Kenan, Mahalalel, Jared,

3 Enọk, Metusela, Lamek, na Noa.

4 Ụmụ Noa bụ Shem, Ham, na Jafet.


Ụmụ Jafet

5 Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.

6 Ụmụ ndị ikom Goma bụ Ashkenaz, na Rifat, na Togama.

7 Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim.


Ụmụ Ham

8 Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.

9 Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama, na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.

10 Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.

11 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,

12 ndị Patrus, na ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.

13 Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,

14 ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,

15 ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,

16 ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.


Ụmụ Shem

17 Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ Aram bụ Uz, Hul, Geta na Meshek.

18 Apakshad bụ nna Shela; Shela bụrụ nna Eba.

19 Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa; aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.

20 Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,

21 Hadoram, Ụzal, Dikla,

22 Obal, Abimael, Sheba,

23 Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.

24 Shem, Apakshad, Shela,

25 Eba, Peleg, Reu,

26 Serug, Nahọ, Tera

27 na Ebram, ya bụ Ebraham.


Ụmụ ndị ikom Ebraham

28 Ụmụ Ebraham mụrụ bụ Aịzik na Ishmel.


Ụmụ ndị ikom Hega

29 Ndị a bụ ụmụ ụmụ ha: Nebaiot (ọkpara Ishmel), Keda, Adbel, Mibsam,

30 Mishma, Duma, Masa, Hadad, Tema,

31 Jetua, Nafish na Kedema. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ishmel.


Ụmụ ndị ikom Ketura

32 Ketura, iko nwanyị Ebraham, mụtaara ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. Jokshan mụtara ndị a: Sheba na Dedan.

33 Ụmụ ndị ikom Midian bụ: Efaa, Efe, Hanok, Abida na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Ketura.


Ụmụ ndị ikom Sera

34 Ebraham mụtara Aịzik. Ụmụ ndị ikom Aịzik bụ Ịsọ na Izrel.


Ụmụ ndị ikom Ịsọ

35 Ịsọ mụrụ ndị a: Elifaz, Reuel, Jeush, Jalam na Kora.

36 Ụmụ Elifaz bụ Teman, Ọmaa, Zefi, Gatam na Kenaz, na Amalek, site na Timna.

37 Ụmụ ndị ikom Reuel bụ: Nahat, Zera, Shama, na Miza.


Ndị Edọm

38 Ụmụ ndị ikom Sia bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan.

39 Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.

40 Ụmụ ndị ikom Shobal bụ Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Zibiọn mụrụ Aịa na Ana.

41 Ana mụrụ Dishọn. Ụmụ Dishọn bụ Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

42 Ụmụ ndị ikom Eza bụ Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ Uz na Aran.


Ndị eze Edọm

43 Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze nke ha. Bela nwa Beoa, onye aha obodo ya bụ Dinhaba.

44 Mgbe Bela nwụrụ Jobab nwa Zera, onye Bozra nọchiri ya dịka eze.

45 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.

46 Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị agha Midia nʼọzara Moab, ghọrọ eze. Isi obodo ya bụ Avit.

47 Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.

48 Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.

49 Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa, nọchiri ya dịka eze.

50 Mgbe Baal-Hanan nwụrụ, Hadad nọchiri ya dịka eze. Akpọrọ isi obodo ya Pai. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa nwa Mezahab.

51 Hadad mesịrị nwụọkwa. Ndịisi ọnụmara nʼEdọm bụ Timna, Alva, Jetet,

52 Oholibama, Elaa, Pinon,

53 Kenaz, Teman, Mibza,

54 Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm.

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™

Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020

Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.

Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.

――――――

Igbo Contemporary Bible™

Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.

Used with permission. All rights reserved worldwide.

Biblica, Inc.
Lean sinn:



Sanasan