Joshua 16 - Bible Nso1 Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el; 2 o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot; 3 ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri. 4 Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha. 5 Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n'akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n'elu; 6 ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n'Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n'akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n'akuku ọwuwa-anyanwu Janoa; 7 o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan. 8 Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di; 9 tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n'etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha. 10 Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n'etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria