Joshua 12 - Bible Nso1 Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu: 2 Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon; 3 na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga: 4 na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei, 5 nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon. 6 Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta. 7 Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè; 8 n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'Araba ahu, na nime nkpọrube nile, na n'ọzara, na nime Negeb; ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 9 eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù; 10 eze Jerusalem, otù; eze Hebron, otù: 11 eze Jamut, otù; eze Lekish, otù; 12 eze Eglon, otù; eze Gezea, otù; 13 eze Debia, otù; eze Geda, otù; 14 eze Họma, otù; eze Arad, otù; 15 eze Libna, otù; eze Adulam, otù; 16 eze Makeda, otù; eze Bet-el, otù; 17 eze Tapua, otù; eze Hefa, otù; 18 eze Efek, otù; eze Lasharon, otù; 19 eze Madon, otù; eze Hezoa, otù; 20 eze Shimron-meron, otù; eze Akshaf, otù; 21 eze Teanak, otù; eze Megido, otù; 22 eze Kedesh, otù; eze Jọkneam nime Kamel, otù; 23 eze Doa n'ebe di elu nke Doa, otù; eze Goim nime Gilgal, otù; 24 eze Tiaza, otù: eze ahu nile di orú na iri na otù. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria