Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.
N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.
O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.
buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.
Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;