4 o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha.
4 Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha.
Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha.
Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.
mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:
Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.
Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru:
Nkpuru ọzọ we da n'ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:
Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha.
Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha.