Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Oziọma Mak 15:1 - Bible Nso

1 Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.

See the chapter Copy




Oziọma Mak 15:1
12 Cross References  

Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,


ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,


Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements