Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Oziọma Mak 1:2 - Bible Nso

2 Dika edeworo ya n'akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n'iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”

See the chapter Copy




Oziọma Mak 1:2
13 Cross References  

Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:


Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.


Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si,


Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.


Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.


(Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu),


Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile;


O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ.


Follow us:

Advertisements


Advertisements