Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 8:8 - Bible Nso

8 Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwu ọkụ nʼime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere osimiri niile chagharịa ghọọ ọbara.

See the chapter Copy




Mkpughe 8:8
13 Cross References  

Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.


Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.


Ọ gēru kwa, n'ala nka nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya.


M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.


N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya.


Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.


Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.


Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.


Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu.


Esitere n'ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n'uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n'ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n'ọnu-ha puta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements