Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 2:2 - Bible Nso

2 Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.

See the chapter Copy




Mkpughe 2:2
21 Cross References  

N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume: Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.


Ma mb͕e ahu ka M'gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M'mara unu: si n'ebe M'nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu.


Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime.


nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist.


ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;


ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;


nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;


Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.


n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.


Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.


Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.


Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.


Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.


Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.


Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n'iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.


Follow us:

Advertisements


Advertisements