Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 18:22 - Bible Nso

22 Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.

See the chapter Copy




Mkpughe 18:22
10 Cross References  

Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.


mb͕e agēmechi uzọ n'amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n'urá n'olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala;


O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.


agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.


Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,


Follow us:

Advertisements


Advertisements