Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 16:17 - Bible Nso

17 Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”

See the chapter Copy




Mkpughe 16:17
13 Cross References  

Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.


nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;


N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.


Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n'ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n'ihi na ihe agēwe n'ubi nke uwa achabigawo ókè.


Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu nke di n'elu-igwe puta, ya onwe-ya nwe-kwa-ra mma-iwe-ihe-ubi di nkọ.


M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.


O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n'isi-iyi miri nke ndu ahu n'efu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements