Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 13:3 - Bible Nso

3 M'we hu otù n'etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n'azu;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.

See the chapter Copy




Mkpughe 13:3
15 Cross References  

M'gēme kwa ka ogwe-aka abua nke eze Babilon sie ike, M'gētiye kwa mma-agham n'aka-ya: ma M'gāb͕aji ogwe-aka abua nke Fero, ọ gāsu kwa ude nke onye emeruru aru nke-uku n'iru ya.


Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo.


Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n'ihe: le, uwa ejesowo Ya n'azu.


Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru.


O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.


O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.


ndi-eze asa di kwa; ise nime ha adawo, otù nime ha nādi adi, onye fọduru akābiaghi; mb͕e ọ gābia ọ ghaghi kwa inọgide nwa oge.


Anu-ọhia ahu nke diri, nke nādighi kwa ub͕u a, ya onwe-ya bu kwa nke-asatọ, o si kwa n'asa ahu puta; ọ nāla kwa n'iyì.


Ndia nwere otù ọlū, ha nēwere kwa ike-ha na ichi-isi-ha nye anu-ọhia ahu.


N'ihi na Chineke tiyere n'obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke.


M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.


Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.


Follow us:

Advertisements


Advertisements