Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 12:4 - Bible Nso

4 Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.

See the chapter Copy




Mkpughe 12:4
22 Cross References  

ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu.


N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:


Agha we puta n'elu-igwe: Maikael na ndi-mọ-ozi-ya buru agha megide dragon ahu; dragon ahu na ndi-mọ-ozi-ya we bue agha;


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.


ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n'ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?


M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta:


Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.


O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,


Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile;


aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu.


Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.


Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.


Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;


otù uzọ n'uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n'oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke ub͕ọ nile.


Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.


N'ihi na ike inyinya ahu di n'ọnu-ha, di kwa n'ọdudù-ha: n'ihi na ọdudù-ha yiri agwọ, nwe kwa isi; ha were kwa ha nēmejọ.


Follow us:

Advertisements


Advertisements