Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Mkpughe 1:3 - Bible Nso

3 Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.

See the chapter Copy




Mkpughe 1:3
15 Cross References  

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.


Jeremaia we si Seraia, Mb͕e i bàra na Babilon, gi le anya ka i gua okwu ndia nile,


Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),


Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


Ma unu ekwela ka otù ihe a me unu nchefu, ndi m'huru n'anya, na otù ubọchi di ka nnù arọ abua na ọgu iri n'anya Onye-nwe-ayi, nnù arọ abua na ọgu iri di kwa ka otù ubọchi.


O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.


Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.


Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.


Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.


Follow us:

Advertisements


Advertisements