Site na nmeb͕u, site kwa n'ikpé, ka ewepuru ya: ma ndi ọb͕ọ-ya, ònye n'etiti ha nātughari n'obi na ebipuru ya n'ala ndi di ndu? site na njehie nke ndim ka ihe-otiti diri ya.
Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.
ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.
N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;
N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.
Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya;
ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.
Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.