Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Juel 1:12 - Bible Nso

12 Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.

See the chapter Copy




Juel 1:12
19 Cross References  

I tiyewo ọṅù n'obim, Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba.


Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.


Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia, Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom. Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala, Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.


Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia; Henna, ya na osisi manu nard nile,


Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n'ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n'ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi.


Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.


Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n'obi ezewo ume.


I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.


Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!


Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.


Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.


Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi?


Chineke we guputa otù ikpuru mb͕e chi bọrọ n'echi-ya, o we ribie ogili-ub͕a ahu, o we kpọnwua.


Nkpuru-ọghigha, ọ̀ di n'ọba rue ub͕u a? ọzọ kwa, osisi vine na osisi fig na osisi pomegranate na osisi olive amighi nkpuru; site n'ubọchi ta ka M'ganāgọzi unu.


M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig.


Follow us:

Advertisements


Advertisements