Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 9:5 - Bible Nso

5 akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.

See the chapter Copy




Joshua 9:5
7 Cross References  

Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.


Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu; Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.


Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:


karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.


ha we were aghughọ me ihe, ọbuná ndi ahu, ha we je, me dika ndi ezìri ozi, ha we chiri akpa kara nká n'elu inyinya-ibu-ha, na karama-akpukpọ manya-vine, nke kara nká, dọwa kwa adọwa, ekezi-kwa-ra ekezi;


Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements