Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 9:19 - Bible Nso

19 Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla.

See the chapter Copy




Joshua 9:19
5 Cross References  

Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.


Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ma umu Israel etib͕ughi ha, n'ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi.


Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements