Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 9:11 - Bible Nso

11 Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.” ’

See the chapter Copy




Joshua 9:11
9 Cross References  

were-kwa-nu ego okpukpu abua n'aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n'ọnu akpa-unu, weghachinu ya n'aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu:


Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n'anya-gi.


N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.


O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.


Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.


na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.


Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:


Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa?


Follow us:

Advertisements


Advertisements