Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 8:3 - Bible Nso

3 Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị

See the chapter Copy




Joshua 8:3
10 Cross References  

Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n'elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n'aka Chineke n'akam.


ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.


onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi,


Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya.


N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.


Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà.


i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.


O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:


Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.


Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia:


Follow us:

Advertisements


Advertisements