Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 8:19 - Bible Nso

19 Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.

See the chapter Copy




Joshua 8:19
5 Cross References  

Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di.


i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.


Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.


Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba.


Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile.


Follow us:

Advertisements


Advertisements