Joshua 8:1 - Bible Nso1 Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi: See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya. See the chapter |
ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.