Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 7:21 - Bible Nso

21 m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”

See the chapter Copy




Joshua 7:21
35 Cross References  

Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.


Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.


Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi.


na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.


O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n'otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n'ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n'ulo-ikwū ọzọ, si n'ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha.


Mu na anyam abua b͕ara ndu; M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?


Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga, Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.


Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.


Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di; Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.


Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:


Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.


Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.


N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?


Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n'elu, ka ewe naputa ya n'ọbu-aka ihe ọjọ!


O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta.


Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.


Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;


N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke.


Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:


Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi;


Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.


Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu.


Ekan we za Joshua, si, N'ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m'mewo-kwa-ra:


Joshua we ziga ndi-ozi, ha we b͕arue ulo-ikwū-ya; ma, le, ezoro ya n'ulo-ikwū-ya, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.


ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n'anya;


Follow us:

Advertisements


Advertisements