Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 7:2 - Bible Nso

2 Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.

See the chapter Copy




Joshua 7:2
18 Cross References  

Ọ we si n'ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n'Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n'Ọdida-anyanwu, Ai di n'Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova.


Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.


Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.


Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n'iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;


Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.


N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.


Ọ biakwasiwo Aiat, ọ gabigawo n'etiti Migron; na Mikmash ka ọ debeworo ihe-ya nile:


Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.


Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.


Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.


Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;


eze Jeriko, otù; eze Ai, nke di n'akuku Bet-el, otù;


Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even.


Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.


Ha we laghachikuru Joshua, si ya, Ka ndi Israel nile ghara irigo; ka ihe ra ka nnù ndikom ise, ma-ọbu ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri, rigo, tib͕ue Ai; emela ka ndi Israel nile dọb͕ue onwe-ha n'ọlu iru ebe ahu; n'ihi na madu ole-na-ole ka ha di.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.


o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia;


Follow us:

Advertisements


Advertisements