Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 4:3 - Bible Nso

3 nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”

See the chapter Copy




Joshua 4:3
11 Cross References  

nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.


Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:


Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.


O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.


Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo.


Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula:


Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu.


Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.


Follow us:

Advertisements


Advertisements