Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 4:23 - Bible Nso

23 N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.

See the chapter Copy




Joshua 4:23
8 Cross References  

Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke m'wuworo.


I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.


O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.


N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.


Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;


Follow us:

Advertisements


Advertisements