Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 4:18 - Bible Nso

18 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n'etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n'ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.

See the chapter Copy




Joshua 4:18
8 Cross References  

Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu.


ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo.


mb͕e ndi nēbu ib͕e ahu biaru-kwa-ra Jọdan, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi, nēbu ib͕e ahu zọyere ukwu-ha nime nsọtu miri, (n'ihi na Jọdan nēruchi usọ-ya nile ubọchi nile nke owuwe-ihe-ubi,)


O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.


Joshua we nye ndi-nchu-àjà iwu, si, Sinu na Jọdan rigota.


Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.


Follow us:

Advertisements


Advertisements